Psalms 5

Abụ Ọma. Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Ọ bụ opi ka e ji abụ ya. Abụ Ọma nke Devid.

Ekpere ụtụtụ

1 Onyenwe anyị, biko, nụrụ ekpere m
tulee ịsụ ude m.
2Geekwa ntị nʼakwa arịrịọ m,
gị Chineke onye bụ eze m.
Nʼihi na ọ bụ naanị gị ka m na-akpọku.

3Ụtụtụ ụbọchị niile, O Onyenwe anyị, ị ga-anụ olu m;
aga m ekwupụtara gị ihe niile na-akpa m mkpa.
Aga m elekwa anya ọsịsa gị.
4Ị bụ Chineke, onye ihe ọjọọ ọbụla anaghị atọ ụtọ;
gị na ndị ajọ omume apụghị ibikọta.
5Ndị mpako agaghị eguzo
nʼihu gị.
Ị kpọrọ ndị niile na-eme ihe ọjọọ asị.
6Ị ga-ala ndị niile na-agha ụgha nʼiyi;
Onyenwe anyị kpọrọ ndị ogbu mmadụ niile
na ndị aghụghọ niile asị.
7Ma mụ onwe m, aga m abata nʼime ụlọ gị,
site nʼoke ịhụnanya gị;
aga m ejikwa ịtụ egwu kpọọ isiala
nʼebe ụlọnsọ ukwuu gị dị.

8 Onyenwe anyị, biko, duo m nʼime ezi omume gị
nʼihi ndị iro m;
mee ka ụzọ gị zie ezi nʼihu m.
9Obi ha jupụtara nʼechiche ịla nʼiyi,
a pụghị ịtụkwasị okwu ọbụla si ha nʼọnụ pụta obi.
Akpịrị ha bụ ili ghere oghe;
ha ji ire ha ekwu okwu ụgha.
10Maa ha ikpe, Chineke.
Mee ka nzube ọjọọ ha niile bụrụ ọdịda ha.
Chụpụ ha nʼihi ịba ụba nke ọtụtụ mmehie ha,
nʼihi na ha enupula isi megide gị.
11Ma mee ka onye ọbụla na-agbaba nʼime gị ṅụrịa;
mee ka ha nọgide na-eti mkpu ọṅụ.
Were aka nchebe gị kpuchie ha,
ka ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ṅụrịa ọṅụ nʼime gị.

12Nʼezie, O Onyenwe anyị, ị na-agọzi onye ezi omume.
Ị na-eji ihuọma gị gbaa ha gburugburu dịka ọta.
Copyright information for IboBIU